1 Kings 22

Amụma Mikaya megide Ehab

1Agha ọzọ adaghị nʼetiti Aram na Izrel afọ atọ. 2Ma nʼafọ nke atọ, Jehoshafat, eze Juda, gara ileta Ehab eze Izrel. 3Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?”

4Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?”

Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.”
5Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka Onyenwe anyị.”

6Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma, ọnụọgụgụ ha ruru narị ndị ikom anọ, jụọ ha sị, “Ọ bụ m gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ ịga?”

Ha zara, “Gaa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ha nʼaka eze.”

7Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”

8Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla,
Nke a, abụghị onye dere akwụkwọ Maika, nke bụ otu akwụkwọ nʼime akwụkwọ nsọ
ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.”

Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”

9Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”

10Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. 11Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ”

12Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”

13Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”

14Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Onyenwe anyị gwara m.”

15Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?”

Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”

16Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”

17Mgbe ahụ Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu. Ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ”

18Eze Izrel, sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”

19Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya. 20Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’

“Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
21Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’

22“ ‘Onyenwe anyị jụrụ sị, Olee otu ị ga-esi mee nke a?’

“ ‘Aga m apụ gaa bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile,’ ka ọ zara.

Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’

23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”

24Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso, maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”

25Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”

26Mgbe ahụ, eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn onye na-achị obodo a, na Joash nwa eze 27ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”

28Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama!”

Ehab anwụọ na Ramọt Gilead

29Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, pụrụ gawa Ramọt Gilead. 30Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.

31Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha ndị na-agba ụgbọ agha, ọnụọgụgụ ha dị iri atọ na abụọ, iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” 32Mgbe ndị ọchịagha, na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Nʼezie, onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, 33ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ma kwụsị ịchụso ya.

34Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ nke uwe agha ya.
Eleghị anya ebe uwe agha ya na-ekpuchiteghị
Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha ya, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ.”
35Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile, e ji ihe mee ka eze kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu. Ọbara si nʼọnya ahụ sọjuru nʼala ụgbọ agha ahụ, ọ nwụrụ nʼuhuruchi ụbọchị ahụ. 36Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!”

37Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya. 38Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu Onyenwe anyị kwubiri. d

39Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 40Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ.

Jehoshafat, eze Juda

41Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel. 42Jehoshafat gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi. 43Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile. 44Jehoshafat mere ka udo dị nʼetiti ya na eze Izrel.

45Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Jehoshafat, ihe niile ndị ọ rụpụtara, ike ọ kpara nʼọtụtụ agha nke o buru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 46O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị. 47Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị.

48Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba. 49Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị.

50Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Ahazaya, eze Izrel

51Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ. 52O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie. 53Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere.

Copyright information for IboBIU